Onyeisi Bola Tinubu abịago n'obodo Rio de Janeiro dị na Brazil ka ọ sonyere na Nzukọ nke iri na asaa (17th Summit) nke Ndịisi na Gọvanọ ndị so na otu BRICS, nke na-elekwasị anya na mmepe mpaghara Global South na mba na akụ na ụba ha na-arị elu. Ụgbọ elu ya ruru n'ala na ọdụ ụgbọ elu agha Galeao n’abalị Fraịdee, n’oge 8:45 n’abalị, ebe ndị agha nyere ya nnabata pụrụ iche. Ndị Minista Brazil, Carlos Duarte na onye ibe ya na-ahụ maka Azụmahịa na Sayensị & Ọganihu, nabatara ya. Tinubu gara dịka ọbịa nke Onyeisi Brazil, Luiz Inacio Lula da Silva, onye kpọrọ ya, a na-atụ anya na ha ga-enwe nzukọ ọnụ n'ụbọchị Satọdee, 5th July, tupu Nzukọ Ukwu ahụ malite n'ụbọchị nke isii ruo nke iri na atọ n’ọnwa July.